Bolanle Raheem: Di onye ọkaiwu kpughere ka onye uwe ojii si gbuo nwunye ya dị ime

Di onye ọkaiwu na Lagos nwụrụ anwụ, Bolanle Raheem ekpughere ka otu onye enyemaka onye nlekọta ndị uwe ojii  bụ Drambi Vandi gbagburu nwunye ya n’ụbọchị ekeresimesi na Ajah.

Gbenga Raheem bụ onye ya na nwunye ya nọ n’ụgbọala oge ihe a mere kwuru ihe butere ọnwụ nke Bolanle bụ onye kwuru na ọ dị ime.

E bugara Bolanle, dị afọ iri anọ na otu, n’ụlọọgwụ, ebe a chọpụtara na ọ nwụola.

Vandi, onye nọ n’ọdụ ndị uwe ojii Ajiwe, Ajah, Lagos steeti, ka ekwuru na ọ nọrọla afọ iri atọ na atọ n’ọrụ ndị uwe ojii  bụ onye gbara ya egbe.

“N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba, nwunye m, ụmụ nwanne m ndi nwoke na nwaanyi, na ụmụnne m ndị bịara ememme a, ha niile gara Ụka. Mgbe anyị na-alaghachi, nwunye m kwuru na ebe ọ bụ ụbọchị ekeresimesi, anyị kwesịrị ịkpọpụ onye ọ bụla, anyị gara nnukwu ụlọ ahịa na Abraham Adesanya, wee gaa Domino’s Pizza.”

“Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị gawara n’ihu Ajah ka anyị mee ntụgharị iji laghachi na Abraham Adesanya. Mgbe anyị tụgharịrị, anyị hụrụ ka ndị uwe ojii na-akwụsị ụfọdụ ụgbọ ala. Ka anyị na-abịaru ha nso, ha sịrị na anyị kwesịrị ịkwụsị, ka anyị na-agakwa, anyị nụrụ oké ụda na windo akụkụ nke nwunye m. Na mberede, ahụrụ m ọbara ka ọ na-arịpụta n’obi ya.”

“Ozugbo m gbapụrụ; ọgọ m nwanyị, bụ́ onye anyị na ya nọkwa, gbapụrụ ọsọ jide onye uwe ojii; onye uwe ojii kpakwara egbe ya. Ịgwa ya okwu enweghị isi, n’ihi ya, agara m ịhụ ma a pụrụ ime ihe ọ bụla; Ahụrụ m nwunye m ka ọ na-eku ume ume, n’oge ahụkwa, ọgọ m nwaanyị kpọbatara onye uwe ojii ahụ n’ụgbọala ma kpọba ya n’oche ihu.”

 

 

Site n’ikike vanguardngr

Jiri obiọma kesaa

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: A na-echekwa ọdịnaya