Ihe Nkuzi | Lessons3

Nkuzi nke anọ:
Akaraedemede Igbo:-

Okwu anyị na-ekwu ka anyị na-ede ede. Ka anyị na-eji ụda dị iche iche ekwu okwu, otu aka ahu, n’odide Igbo, akaraedemede dị iche iche na-abata.

Ọ bụ akaraedemede na-egosi nke a n’odide.
Ndi a bụ ụfọdụ akaraedemede Igbo:
1. Kpom rikom (Semi colon ;): kpomrikom bu akaraedemede e ji egosi nnukwu nkuru ume mgbe a na-agu ahiriokwu e dere ede nke na-egosi na-edechabeghi ihe ebu n’uche. Imaatu:
a. E mere elu e mere ala; anyi nwe mmeri.
b. Puo ebe a; olee onye kporo gi n’okwu a.
ch. Gini ka unu na-acho n’ulo anyi; anyi ji unu ugwo?
d. Mmadu dum ga-anwu; onwu bu ugwo onye obula ji Chukwu.
2. Akarauhie (Hyphen -)
Nke a bu akaraedemede na-egosi okwu abuo na-aruko oru onu nke anaghi edekota onu ka otu mkpuruokwu. O bu mmekorita okwu abuo a mere na-eji akarauhie (-) wee na-ejikota ha abuo onu.
Imaatu :
a. Anyi ga-ata anu.
b. Okeke na-agu akwukwo.
ch. O na-eje ahia.
d. Ha ga-abia echi.
e. Nne m na-esi nri.
3. Akara kpom (Fullstop .)
Nke a bu akaraedemede e ji egosi nkwusi okwu ma o bu ahiriokwu. E ji akara kpom akapia okwu onu iji gosi na ahiriokwu ahu abiala n’isi njedebe.
Imaatu:
a. Rie.
b. Ada mara mma.
ch. Taa bu uka.
d. A bu m onye oru oyibo.
e. Nwata ahu enweghi uche.
4. Akara ajuju (Question mark ?)
Nke a bu akaraedemede na-egosi na ahiriokwu bu ajuju.
Imaatu :
a. Onye ka i bu?
b. Kedu ka i mere?
ch. Gini bu aha gi?
d. Unu abiala?
e. Olee ebe ha gara?

5. Akara mkpu (Exclamation Mark !)
Nke a bu akaraedemede na-egosi na ahiriokwu bu mkpu. E ji olu ike aguputa ahiriokwu bu mkpu.
Imaatu:
a. Chei, efuo moo!
b. Hei, lee agwo!
ch. Ewo! O bu ka uwa di?
d. Onwu! Gini ka m mere gi?

 

6) Rịkọm elu – (‘) Apostrophe

7) Rịkọm ala – (,) Comma

8) Kpọm Kpọm ma ọ bụ Kọlọn – ( : ) Colon

9) Akara mkpuchi ma ọ bụ ngudo – ( ) Bracket

10) Akara udaolu – ( /\-) Tone Marks

11) Akarangwu – ( ” ) Quotation Marks

12) Akara Ndebiri – (…) Elipses
Jiri obiọma kesaa

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: A na-echekwa ọdịnaya