Ọkụ agbaala ụlọ ahịa dị n’ahịa akụkụ akpaaka ụgbọ ala na Legọs | Lagos Market Fire
Ụfọdụ ụlọ ahịa agbabiela n’ahịa Akere bụ ahịa akụkụ akpaaka ụgbọ ala, na Olodi-Apapa dị na mpaghara Ajegunle nke Legọs steeti ka ọkụ gbawara n’isi ụtụtụ taa bụ Wenezde.
Ndị na-ahụ maka ọkụ na Legọs steeti, kwuru na ụlọ ọrụ mgbanyụ ọkụ Ajegunle ha emeriela ọkụ a.
A na-enyo enyo na ụfọdụ ndị omekome gbara ahịa ahụ ọkụ ka ha gbuchara onye ọrụ nchekwa n’ahịa ahụ.
Lee onyonyo ebe a:
Ụfọdụ ụlọ ahịa agbabiela n'ahịa Akere bụ ahịa ụgbọ ala, na Olodi-Apapa dị na mpaghara Ajegunle nke Legọs steeti ka ọkụ gbawara n'isi ụtụtụ taa bụ Wenezde.
Ndi igbo biko ka anyi bido leba anya ikwalite ọwụwa anyanwụ, ebe ahụ bụ ebe obibi anyị#EkwendiIgbo pic.twitter.com/MgpZoI4RM1— Ekwe Ndị Igbo (@EkweNdiIgbo) March 8, 2023