Patience Ozokwo: Ụmụ m rịọrọ m ka m ghara ịlụ di ọzọ

Onye na-eme ihe nkiri Nollywood bụ Patience Ozokwo ekwupụtala ihe kpatara na ọ jụrụ ịlụ di ọzọ ka di ya nwụsịrị afọ ole na ole gara aga.

Patience Ozokwo mere ka a mara nke a mgbe ya na onye ọrụ ibe ya Mercy Johnson, nwere mkparịta ụka na mbipụta ya kwa izu nke ihe ngosi nri nri ya, nke a na-akpọ Mercy’s Menu.
Patience kwuru, “Achọrọ m ịlụ di ọzọ mana ụmụ m etoola wee rịọ m ka m ghara ịlụ nwoke ọzọ, ha kwere nkwa na ha ga-abụ di m.

Ha gwara m ka m ghara ilụ di, ka ndị enyi ha ghara ịchị ha ọchị maka na ha etoola, mama ha lụgharịrị di ma m ghọtara ha. Ọ bụ ezie na ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’ebe ha nọ, ma akwụụrụ m ha nnukwu àjà ahụ, ọ dịghị àjà ọ bụla buru ibu maka ezinụlọ.”

 

Jiri obiọma kesaa

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: A na-echekwa ọdịnaya