D.M.G.S gbara afọ iri itoolu na asatọ taa

Dennis Memorial Grammar School bụ ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị na Onicha, Anambra steeti a gbara afọ iri itoolu na asatọ.

Na Jenụarị 25, 1925, e meghere ụlọ akwụkwọ a (DMGS), ma otu a ka onye ozi ala ọzọ nke Ụka mụnyere ìhè na mmepe mmụta n’ala lgbo; ebe a na-apụghị imenyụ emenyụ.
Ụmụ akwụkwọ nke mbụ bụ ndị na-ebi n’ụlọ di iri na itoolu na ụmụ akwụkwọ ụbọchị di iri anọ na isii.

Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ si Onitsha na obodo ndị gbara ya gburugburu bụ́ ebe ndị ozi ala ọzọ rụrụ ọrụ ihe karịrị ọkara narị afọ, bụ́ ebe ndị mmadụ maliteworo ịghọta uru mmụta Bekee bara n’ụzọ akụ̀ na ụba.

Ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ mbụ ka dị ndụ, Otu n’ime ha e nwere ike ịkpọ:
i. Harford Anierobi (onye isi ọrụ nchịkwa lara ezumike nka)
ii. Isaac Iweka (onye ọsụ ụzọ Civil Injinia, Eze nke Obosi)
iii. Wilfred Mbonu (Ụkọchukwu Canon lara ezumike nka nke Ụka Anglican)
iv. Isaac Nwangwu (onye ọrụ obodo lara ezumike nka)
v. Alfred Ogbolu (onye ọrụ obodo lagoro ezumike nka)
vi. Jonathan Ogbonna Ekeocha (onye gụrụ akwụkwọ lagoro ezumike nka) na
vii. Walter Onubogu (onye na-ahụ maka ahụike ama ama) N’etiti ndị ọzọ.

 

Anyị sokwa D.M.G.S na-aṅụrị ọṅụ maka nnukwu mmezu a.

Lee ụfọdụ onyonyo ụlọ akwụkwọ a n’okpuru:

DMGS in 1962

 

Site n’ikike nke: dmgs.donschools.com

Jiri obiọma kesaa

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: A na-echekwa ọdịnaya