Ihe Nkuzi | Lessons2

Nkuzi nke atọ:
Mgbochiume bu otu ngalaba n’ime mkpuruedemede Igbo nke na-enweghi uda dika udaume, lee ha ebe a:
B b, CH ch, D d, F f, G g, GB gb, GH gh,
GW gw, H h, J j, K k, KP kp, KW kw, L l,
M m, N n, Ṅ ṅ, NW nw, NY ny, P p, R r,
S s, SH sh, T t, V v, W w, Y y, Z z

 

Mgbochiume igbo dị iri abụọ na asatọ, e nwere ndi eji mkpụrụ edemede abụọ mebe ka a na-akpo Mgbochiume gbara mkpi, ha dị itoolu:
CH ch, GB gb, GH gh, GW gw, KP kp,
KW kw, NW nw, NY ny, SH sh

 

E nwere ihe a na-akpo Myiriudaume, ha bụ: m na n
Myiriudaume abụọ a na aru oru abụọ.
Ebe obula ha nwere uda aka nke ha,ha na aru oru ebe ahu di ka Myiriudaume.
Ihe Nlereanya: Mmadu, Mmiri, Nne, Nna

 

Ebe obula ha enweghi uda aka nke ha ,ha na aru oru dị ka mgbochiume.
Ihe Nlereanya: Mkpụrụ, Mgbe, Ano, Nkebi, dịrị gawazịa
Jiri obiọma kesaa

2 thoughts on “Ihe Nkuzi | Lessons2

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: A na-echekwa ọdịnaya