Ihe Nkuzi | Lessons

Nkuzi nke mbụ:
Mkpuru Edemede Igbo na Usoro Odide Ya
Mkpuru edemede bu mkpuru abidii eji edeputa mkpuruokwu igbo
N’afo 1961, ndi otu ahoputara mere nnyocha n’ihe gbasara asusu Igbo a na-akpo Onwu Komitii mere
ka o doo anya na o bu iri ato na isii ka mkpuruedemede igbo di. O bu makana aha onyeisi otu ahu a
na-akpo Onwu Komitii bu Mazi S. E. Onwu ka eji akpo ya aha a ebe a na-akpo mkpuruedemede otu a
haziri ka ejiri na-ede asusu Igbo Onwu Otografii ma o bu mkpuruedemede Onwu.
N’asụsụ ọ bụla a na-ede ede, o kwesiri na onye ọ bụla chọrọ ide ya nke oma ga-amata mkpụrụ asụsụ ahụ.
Lee usoro ide mkpụrụabịdịị Igbo:-
Mkpụrụasụsụ abịdịị Ukwu
A B CH D E F G GB GH
GW H I Ị J K KP KW L
M N Ṅ NW NY O Ọ P R
S SH T U Ụ V W Y Z

 

Mkpụrụasụsụ abịdịị Nta
a b ch d e f g gb gh
gw h i ị j k kp kw l
m n ṅ nw ny o ọ p r
s sh t u ụ v w y z

 

Mkpụrụabịdịị Igbo dị iri atọ na isii, e nwere ndi gbara mkpi, ha di itoolu, lekwa ha ebe a:
CH ch GB gb GH gh GW gw KP kp
KW kw NW nw NY ny SH sh

 

Nkuzi nke abụọ:
Gini bụ Ụdaume Igbo?
Nke a bụ ụda obụla si n’olu na-enweghi mmetụta nke ire,eze ma ọ bụ egbụgbere ọnụ nke sitere n’etu e siri dewe ọnụ wee dapụta. Ha dị asatọ:
A a, E e, I i, Ị ị, O o, Ọ ọ, U u, Ụ ụ

 

E nwere Ụdamfe na Ụdaarụ.
Ndi a bụ Ụdamfe: A a, Ị ị, Ọ ọ, Ụ ụ,
Ihe Nlereanya:
Aka, Ịkpa, Ọzọ, Ụkwụ, Agwa, Abụọ, Ọmụmụ, Ndakọrịta, n’etiti ndị ọzọ

 

Ndi a bụ Ụdaarụ: E e, I i, O o, U u
Ihe Nlereanya:
Omume, Oriri, Nwoke, Uche, Ute, Wepu, Rie, Nwere, Ihe, Nkume, n’etiti ndị ọzọ
Jiri obiọma kesaa

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: A na-echekwa ọdịnaya