Ihe Nkuzi | Lessons
Nkuzi nke mbụ:
Mkpuru Edemede Igbo na Usoro Odide Ya
Mkpuru edemede bu mkpuru abidii eji edeputa mkpuruokwu igbo
Mkpuru edemede bu mkpuru abidii eji edeputa mkpuruokwu igbo
N’afo 1961, ndi otu ahoputara mere nnyocha n’ihe gbasara asusu Igbo a na-akpo Onwu Komitii mere
ka o doo anya na o bu iri ato na isii ka mkpuruedemede igbo di. O bu makana aha onyeisi otu ahu a
na-akpo Onwu Komitii bu Mazi S. E. Onwu ka eji akpo ya aha a ebe a na-akpo mkpuruedemede otu a
haziri ka ejiri na-ede asusu Igbo Onwu Otografii ma o bu mkpuruedemede Onwu.

N’asụsụ ọ bụla a na-ede ede, o kwesiri na onye ọ bụla chọrọ ide ya nke oma ga-amata mkpụrụ asụsụ ahụ.
Lee usoro ide mkpụrụabịdịị Igbo:-
Mkpụrụasụsụ abịdịị Ukwu
A B CH D E F G GB GH
GW H I Ị J K KP KW L
M N Ṅ NW NY O Ọ P R
S SH T U Ụ V W Y Z
Mkpụrụasụsụ abịdịị Nta
a b ch d e f g gb gh
gw h i ị j k kp kw l
m n ṅ nw ny o ọ p r
s sh t u ụ v w y z
Mkpụrụabịdịị Igbo dị iri atọ na isii, e nwere ndi gbara mkpi, ha di itoolu, lekwa ha ebe a:
CH ch GB gb GH gh GW gw KP kp
KW kw NW nw NY ny SH sh
Nkuzi nke abụọ:
Gini bụ Ụdaume Igbo?
Nke a bụ ụda obụla si n’olu na-enweghi mmetụta nke ire,eze ma ọ bụ egbụgbere ọnụ nke sitere n’etu e siri dewe ọnụ wee dapụta. Ha dị asatọ:
A a, E e, I i, Ị ị, O o, Ọ ọ, U u, Ụ ụ
E nwere Ụdamfe na Ụdaarụ.
Ndi a bụ Ụdamfe: A a, Ị ị, Ọ ọ, Ụ ụ,
Ihe Nlereanya:
Aka, Ịkpa, Ọzọ, Ụkwụ, Agwa, Abụọ, Ọmụmụ, Ndakọrịta, n’etiti ndị ọzọ
Ndi a bụ Ụdaarụ: E e, I i, O o, U u
Ihe Nlereanya:
Omume, Oriri, Nwoke, Uche, Ute, Wepu, Rie, Nwere, Ihe, Nkume, n’etiti ndị ọzọ